Isi-okwu di nkpà nke aha-akwukwọ nka bu "imu ọzọ site na Miri na Mọ Nsọ." O nwere ihe mbu n'isi-okwu ahu. Ya bu, akwukwọ nka nagwa ayi n'ebe ọ di ọcha ihe imu ọzọ bu na otú esi amu madu ọzọ site na miri na Mọ Nsọ dika Akwukwọ Nsọ si disie ike. Miri ahu negosi baptism Jisus na Jọdan ma Akwukwọ Nsọ we si kwa na nmehie nile ayi ka atukwasiworo na Jisus mb͕e emere-Ya baptism site n'aka Jọn Baptist. Jọn bu onye nanọchi ndi madu dum na nkpuru Eron Onye-isi-nchu-àjà. Eron bikwasiri aka-ya abua n'isi ewu-ọpupu ahu we tukwasi kwa nmehie nile nke arọ ndi Israel na ya n'Ubọchi Nkpuchi-nmehie. Ọ bu onyinyo nke ezi ihe ahu nile gaje ibia. Baptism Jisus bu ihe-atù nke ibikwasi-aka-n'isi. Emere Jisus baptism n'udi ibikwasi-aka-n'isi na Jọdan. Ya mere Ọ bupuru nmehie nile nke uwa site na baptism-Ya ewe kpọgide-Ya n'obe ikwu ugwọ nmehie nile. Kama ndi-Kristian dikariri ọtutu amaghi ihe mere ejiri me Jisus baptism site n'aka Jọn Baptist na Jọdan. Baptism Jisus bu isi-okwu nke akwukwọ nka, bu kwa-ra otù akuku di nkpà n'Ozi ọma Miri na Mọ Nsọ. Apuru imu ayi ọzọ nání site n'ikwere na baptism Jisus ya na Obe-Ya.
Dieser Download kann aus rechtlichen Gründen nur mit Rechnungsadresse in A, B, CY, CZ, D, DK, EW, E, FIN, F, GR, H, IRL, I, LT, L, LR, M, NL, PL, P, R, S, SLO, SK ausgeliefert werden.